Onye ọbụla na a kpọ nwanne ya 'Onye Nzuzu' ga e je n'ọkụ ala mmụọ. Ya mere, ọbụrụ na i weta onyinye gị n'ihu ebe nchụaja, wee cheta n'ebe aahụ na gị na nwanne gị a dịghị na mma, hapụ onyinye gị n'ebe aahụ n'ihu ebe nchụaja. Buru ụzọ jee ka gị na nwanne gị mezie. Ụnụ dozisịa, bịa chee onyinye gị n'ihu Chineke. Gị na onye gbara gị akwụkwọ, kpụrụ gị na a gaje ụlọ ikpe, mee enyi ngwa ngwa mgbe gị na ya ka nọ n'ụzọ, ka ọ ghara i nyefe gị n'aka onye ọkaikpe. Onye ọkaikpe e wee duru gị nye ndị uwe-ojii, ndị uwe-ojii e wee tinye gị n'ụlọ mkpọrọ. Na ị gwa gị eziokwu, i nweghị ike i si ebe aahụ pụta ma ọlị, ruo mgbe ị kwụzuru ụgwọ nile i ji.]
“Ụnụ a nụla na e kwuru sị: 'A kwala iko'. Ma a na M a gwa ụnụ: Onye ọbụla lere nwanyị anya, ka agụụ nwanyị aahụ gụọ ya, a kwasola ya rịị iko n'obi ya. [Ya mere, ọbụrụ na anya akanri gị na a kpatara gị ị daba na njọ, ghụpụ ya, tụfuo! Ọ kara gị mma ị tụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa i debe ya, a tụnye ahụ gị nile n'ọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụkwa akanri gị na a kpatara gị ị daba na njọ, gbupụ ya, tụfuo. Ọ kara gị mma ị tụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa i debe ya, a tụnye ahụ gị nile n'ọkụ ala mmụọ.
“E kwukwara sị, 'Onye ọbụla chụpụrụ nwunye ya, ya nye ye akwụkwọ alụkwaghị m.' Ma a na M a gwa ụnụ: Nwoke ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị n'ihi alụmdi na e zighị e zi, na e me nwanyị aahụ onye na a kwa iko. Otu aka aahụ onye ọbụla lụrụ nwanyị kewapụrụ na di, na a kwa iko.]
“Ọzọ, ụnụ nụrụ na a gwara ndị mgbe ochie sị: 'A ñụla iyi ụgha, kama nyeghachi Onyenweanyị ihe ị ñụrụ n'iyi.' Ma a na M a gwa ụnụ: A ñụla iyi ma ọli. [E jila eluigwe a ñụ iyi n'ihi na ọ bụ oche eze Chineke. E jikwala ala a ñụ iyi n'ihi na ọ bụ oche mgbakwasị ụkwụ Chineke. E jila Jerusalem a ñụ iyi, n'ihi na ọ bụ obodo nke eze ukwu aahụ. E jikwala isi gị a ñụ iyi, n'ihi na ị pụghị i me ka otu ntutu isi gị dị ọcha mọbụ oji.] Ya mere, ka okwu gị nile bụrụ, “Ee” mgbe ị chọrọ i kwu Ee, mọbụ “Mba” mgbe ị chọrọ i kwu Mba. Okwu ọbụla karịrị nkea si n'aka ajọ onye.
Oziọma nke Oseburụwa
Otito dịrị Gị Kristi
EKPERE NHUNYE
Dinwenụ, anyị na a rịọ ka onyinye anyị na e hunyere Gị wụchaa anyị, mekwaa ka anyị dị ọhụrụ. Biko mee ka anyị na e me uche Gị ruo n'ọnwụ, i ji nweta ụgwọ na Kristi Onyenweanyị.
UKWE ORIRI NSỌ
Ha riri rijuchaa afọ. Dinwenụ nyere ha ihe ha chọrọ: Ọ hapụghị ha na mkpa ha.
EKPERE A NATACHAA ORIRI NSỌ
Dinwenụ, I nyela anyị nri ọma nke eluigwe. Biko, mee ka anyị na e nwe agụụ oge nile maka achịcha nkea na e nye ezigbo ndụ. Site na Kristi Dinwenụ anyị.
MỌNDEE 16/02/2026 Nkwọ
Izụka 6 (Afọ 2) - GREEN
EKPERE MMEGHE
Chineke Nna anyị, ndị ji ezi obi na eziokwu e fe Gị ka I weere ka ndị nke Gị. Biko nye anyị amara Gị, ka anyị na e bi ụdị ndụ aahụ na a masị Gị, ka anyị wee bụrụ ndị kwesịrị e kwesị ị bata n'ebe obibi Gị. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi Nwa Gị, Onye Gị na Ya dị ndụ, na a chị n'ịdịkọnotu nke Mmụọ Nsọ, Chukwu, site n'ụwatụwa nile.
IHE ỌGỤGỤ e wetara n'akwụkwọ ozi Jemis dị asọ dere
1:1-11
Jemis, nwodibo Chineke na nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na e degara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara n'elu ụwa nile akwụkwọ ozi: Ndewonụ!
Ụmụnna m! Gụọnụ onwe ụnụ na ndị ihe ọma meere, mgbe ọbụla a na a nwa ụnụ mọbụ mgbe ụnụ zutere ọnwụnwa n'ụzọ dị iche iche. N'ihi na, dịka ụnụ maara, nnwale a na a nwale okwukwe ụnụ na e me ka ụnụ kwụdosie ike. Ka nkwụdosike ụnụ merie ọnwụnwa nile, ka ụnụ zuo oke ma nwezuo ihe nile, na a dịghị ihe ọbụla nke dị mkpa kọrọ n'ime ụnụ.
Ọbụrụ na o nwere onye ọbụla m'ime ụnụ nke na e nweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na e nye mmadụ nile n'efu, na e bughị ụzọ taa mmadụ ụta. Ọ ga e nyekwa onye aahụ amamihe! Mgbe ị na a rịọ ya arịrịọ dị otua, jide okwukwe, e nwela obi abụọ. Onye nwere obi abụọ n'ekpere yiri ebili mmiri oke osimiri, nke ifufe na e bugharị na a tụli elu. Onye dị otua e chekwala na ya ga a rịọta ihe dị ya mkpa n'aka Onyenweanyị. N'ihi na mmadụ dị otua bụ onye ihu abụọ, onye na a dịghị e guzo n'otu ebe n'ihe ọbụla ọ na e me.
Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ñụrịa ọñụ mgbe ọbụla Chineke weliri ya elu. Ka nwanna ọbụla bụ ọgaranya ñụrịkwa ọñụ mgbe ọbụla e wedara ọnọdụ ya n'ihi na dịka okooko ọcha, ọgaranya ga e wuchaa gafee. Anyanwụ na a walite, ya na ọkụ ya na e resi ike, kpọnwụọ ahịhịa. Okooko ọcha ya daa, ịmamma ya a laa n'iyi. Otua ka ọgaranya ga e si daa mgbe ọ nọ na a chụso akụnụba.
Okwu nke Oseburụwa
Ekele dịrị Chukwu